Native Bible

2 Chronicles 29:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.

2 Chronicles 29:18 in English

2 Chronicles 29:18 · Berean Standard Bible

Then they went in to King Hezekiah and reported, “We have cleansed the entire house of the LORD, the altar of burnt offering with all its utensils, and the table of the showbread with all its utensils.

Context

16Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn. 17Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ. 18Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya. 19Ọzọ, anyị edoziela ma dokwaa ngwongwo ahụ niile nsọ, bụ nke eze Ehaz wepụrụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ya mgbe ọ bụ eze. Ha dịkwa ugbu a nʼihu ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị.” 20Nʼụtụtụ echi ya, eze bụ Hezekaya kpọkọtara ndịisi obodo niile, gaa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.