2 Ihe E Mere 29:16
2 Chronicles 29:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn.
2 Chronicles 29:16 in English
2 Chronicles 29:16 · Berean Standard Bible
So the priests went inside the house of the LORD to cleanse it, and they brought out to the courtyard all the unclean things that they found in the temple of the LORD. Then the Levites took these things and carried them out to the Kidron Valley.
Context
14nʼikwu Heman:
Jehiel, na Shimei;
nʼikwu Jedutun:
Shemaya, na Uziel. 15Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị. 16Ndị nchụaja banyere nʼime ebe nsọ ahụ ido ya nsọ. Ihe niile na-adịghị ọcha ha hụrụ nʼime ya ka ha wepụtasịrị nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ndị Livayị buuru ha gaa bufuo na Ndagwurugwu Kidrọn. 17Ha bidoro mmemme ido nsọ a nʼabalị mbụ nʼọnwa nke mbụ. Nʼabalị nke asatọ ha ruru na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma o were ha abalị asatọ ọzọ idochasị ụlọnsọ ahụ nsọ maka ofufe, ha jezuru ozi niile nʼabalị iri na isii nke ọnwa mbụ ahụ. 18Mgbe ahụ, ha bakwuru eze bụ Hezekaya kọọrọ ya sị, “Anyị emeela ebe niile nʼụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ dị nsọ, ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na ngwongwo ya, na tebul ịdọba achịcha e doro nsọ, na ihe niile dị nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.