Native Bible

2 Chronicles 22:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.

2 Chronicles 22:3 in English

2 Chronicles 22:3 · Berean Standard Bible

Ahaziah also walked in the ways of the house of Ahab, for his mother was his counselor in wickedness.

Context

1Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị. 2Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel. 3Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume. 4O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya. 5O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.