Native Bible

2 Chronicles 22:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị.

2 Chronicles 22:1 in English

2 Chronicles 22:1 · Berean Standard Bible

Then the people of Jerusalem made Ahaziah, the youngest son of Jehoram, king in his place, since the raiders who had come into the camp with the Arabs * had killed all the older sons. So Ahaziah son of Jehoram became king of Judah.

Context

1Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị. 2Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel. 3Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.