2 Ihe E Mere 22:4
2 Chronicles 22:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya.
2 Chronicles 22:4 in English
2 Chronicles 22:4 · Berean Standard Bible
And he did evil in the sight of the LORD, as the house of Ahab had done, for to his destruction they were his counselors after the death of his father.
Context
2Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel. 3Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume. 4O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya. 5O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ, 6ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ.
Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.