1 Samuel 3:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.
1 Samuel 3:19 in English
1 Samuel 3:19 · Berean Standard Bible
And Samuel grew, and the LORD was with him, and He let none of Samuel’s words fall to the ground.
Context
17Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.” 18Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.” 19Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo. 20Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi. 21Onyenwe anyị gakwara nʼihu na-egosi onwe ya na Shaịlo. Nʼebe ahụ o gosiri onwe ya nye Samuel site nʼokwu ya.
3:3 Oriọna dị nʼebe nsọ ahụ kwesiri ị na-enwu ọkụ ehihie na abalị ọbụla. Ọpụ 27:20-21; 30:7-8 Ọ bụ nʼisi ụtụtụ tupu chi abọọ ka ihe a mere.
3:13 1Sa 2:12,17,22
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.