1 Samuel 3:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”
1 Samuel 3:18 in English
1 Samuel 3:18 · Berean Standard Bible
So Samuel told him everything and did not hide a thing from him. “He is the LORD,” replied Eli. “Let Him do what is good in His eyes.”
Context
16Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.”
Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.” 17Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.” 18Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.” 19Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo. 20Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.