Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”

1 Samuel 28:11 in English

1 Samuel 28:11 · Berean Standard Bible

“Whom shall I bring up for you?” the woman asked. “Bring up Samuel,” he replied.

Context

9Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?” 10Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.” 11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.” 12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!” 13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi* ka o si nʼala na-arịgopụta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.