Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”

1 Samuel 28:12 in English

1 Samuel 28:12 · Berean Standard Bible

But when the woman saw Samuel, she cried out in a loud voice and said to Saul, “Why have you deceived me? You are Saul!”

Context

10Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.” 11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.” 12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!” 13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi* ka o si nʼala na-arịgopụta.” 14Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.