1 Samuel 28:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi* ka o si nʼala na-arịgopụta.”
1 Samuel 28:13 in English
1 Samuel 28:13 · Berean Standard Bible
“Do not be afraid,” the king replied. “What do you see?” “I see a god * coming up out of the earth,” the woman answered.
Context
11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?”
Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.” 12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!” 13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?”
Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi* ka o si nʼala na-arịgopụta.” 14Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?”
Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.”
Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala. 15Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?”
Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.