Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,

1 Samuel 26:3 in English

1 Samuel 26:3 · Berean Standard Bible

Saul camped beside the road at the hill of Hachilah opposite Jeshimon, but David was living in the wilderness. When he realized that Saul had followed him there,

Context

1Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara. 2Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid. 3Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara, 4Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie. 5Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.