1 Samuel 26:1
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara.
1 Samuel 26:1 in English
1 Samuel 26:1 · Berean Standard Bible
Then the Ziphites came to Saul at Gibeah and said, “Is not David hiding on the hill of Hachilah, opposite Jeshimon?”
Context
1Ndị Zif jekwuru Sọl na Gibea gwa ya na Devid na-ezo onwe ya nʼugwu Hakila nke chere ihu nʼọzara. 2Nʼihi ya, Sọl biliri chịrị puku ndị agha atọ o leziri anya họpụta nʼetiti ndị agha Izrel, duru ha gaa nʼọzara Zif ịchọ Devid. 3Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.