Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya.

1 Samuel 26:5 in English

1 Samuel 26:5 · Berean Standard Bible

Then David set out and went to the place where Saul had camped. He saw the place where Saul and Abner son of Ner, the general of his army, had lain down. Saul was lying inside the inner circle of the camp, with the troops camped around him.

Context

3Sọl mara ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ụzọ ugwu nta Hakila na ncherita ihu Jeshimọn nke nọ nʼokporoụzọ. Ma ka Devid nʼonwe ya nọ nʼime ọzara, ọ hụrụ na Sọl chụụrụ ya bata nʼime ọzara, 4Devid zipụrụ ndị nledo, matakwa na Sọl bịara nʼezie. 5Emesịa, Devid pụrụ jeruo ebe Sọl mara ụlọ ikwu ya. Ọ hụrụ ebe Sọl na Abna nwa Nea, onyeisi agha dinara ala. Sọl dina nʼime ogige ụlọ ikwu ahụ, ndị agha ya dinakwara gburugburu ya. 6Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya* onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?” Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.” 7Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.