Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze.

1 Samuel 26:15 in English

1 Samuel 26:15 · Berean Standard Bible

So David said to Abner, “You are a man, aren’t you? And who in Israel is your equal? Why then did you not protect your lord the king when one of the people came to destroy him?

Context

13Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha. 14Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?” 15Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze. 16Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?” 17Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?” Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.