Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?”

1 Samuel 26:14 in English

1 Samuel 26:14 · Berean Standard Bible

And David shouted to the troops and to Abner son of Ner, “Will you not answer me, Abner?” “Who calls to the king?” Abner replied.

Context

12Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra. 13Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha. 14Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!” Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?” 15Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze. 16Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.