1 Samuel 26:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?”
1 Samuel 26:16 in English
1 Samuel 26:16 · Berean Standard Bible
This thing you have done is not good. As surely as the LORD lives, all of you deserve to die, since you did not protect your lord, the LORD’s anointed. Now look around. Where are the king’s spear and water jug that were by his head?”
Context
14Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!”
Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?” 15Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze. 16Ihe a i mere adịghị mma. Nʼeziokwu, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, gị na ndị ikom gị kwesiri ọnwụ, nʼihi na gị na ndị gị echebeghị onyenwe unu, bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ebee ka ùbe eze, na ihe mmiri ọṅụṅụ ya, nke dị nʼakụkụ isi ya dị?” 17Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ olu Devid, ọ sịrị, “Ọ bụ gị nwa m, Devid?”
Devid zara sị ya, “E, ọ bụ olu m, onyenwe m, eze.” 18Ọ sịkwa, “Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achụgharị ohu ya? Gịnị ka m mere? Gịnịkwa bụ ihe ọjọọ ị chọtara nʼaka m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.