1 Samuel 26:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha.
1 Samuel 26:13 in English
1 Samuel 26:13 · Berean Standard Bible
Then David crossed to the other side and stood atop the mountain at a distance; there was a wide gulf between them.
Context
11Ma Onyenwe anyị ekwela ka m setịpụ aka megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ugbu a, weta ùbe na ihe ịṅụ mmiri nke dị nʼakụkụ isi ya, ka anyị si nʼebe a pụọ.” 12Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra. 13Mgbe ahụ, Devid pụrụ gafee nʼofe nke ọzọ, guzo onwe ya nʼelu ugwu ebe dị anya, ebe mbara dị nʼetiti ya na ha. 14Devid kpọrọ Abna nwa Nea na ndị agha oku sị, “Abna, za m oku!”
Abna jụrụ ya sị, “Onye ka ị bụ i ji si otu a na-eti mkpu ịkpọte eze?” 15Devid sịrị, “Nʼezie, ọ bụghị nwoke ka ị bụ? Onye dịkwa ka gị nʼIzrel niile? Gịnị mere i ji hapụ ichezi onyenwe gị eze nke ọma? Otu onye bịara igbu onyenwe gị, bụ eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.