Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m,* nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.

1 Samuel 24:17 in English

1 Samuel 24:17 · Berean Standard Bible

and said to David, “You are more righteous than I, for you have rewarded me with good, though I have rewarded you with evil.

Context

15Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.” 16Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. 17Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m,* nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m. 18E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m. 19Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.