1 Samuel 24:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
1 Samuel 24:15 in English
1 Samuel 24:15 · Berean Standard Bible
May the LORD be our judge and decide between you and me. May He take notice and plead my case and deliver me from your hand.”
Context
13Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka. 14“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? 15Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.” 16Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. 17Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m,* nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.