1 Samuel 24:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.
1 Samuel 24:13 in English
1 Samuel 24:13 · Berean Standard Bible
As the old proverb says, ‘Wickedness proceeds from the wicked.’ But my hand will never be against you.
Context
11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. 12Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. 13Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka. 14“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? 15Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.