Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.

1 Samuel 24:11 in English

1 Samuel 24:11 · Berean Standard Bible

See, my father, look at the corner of your robe in my hand. For I cut it off, but I did not kill you. See and know that there is no evil or rebellion in my hands. I have not sinned against you, even though you are hunting me down to take my life.

Context

9Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? 10Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ 11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. 12Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. 13Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.