Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’

1 Samuel 24:10 in English

1 Samuel 24:10 · Berean Standard Bible

Behold, this day you have seen with your own eyes that the LORD delivered you into my hand in the cave. I was told to kill you, but I spared you and said, ‘I will not lift my hand against my lord, since he is the LORD’s anointed.’

Context

8Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala. 9Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? 10Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ 11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. 12Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.