Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.”

1 Samuel 23:2 in English

1 Samuel 23:2 · Berean Standard Bible

So David inquired of the LORD, “Should I go and attack these Philistines?” And the LORD said to David, “Go and attack the Philistines and save Keilah.”

Context

1Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila* agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. 2Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.” 3Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?” 4Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.