Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila* agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile.

1 Samuel 23:1 in English

1 Samuel 23:1 · Berean Standard Bible

Now it was reported to David, “Look, the Philistines are fighting against Keilah and looting the threshing floors.”

Context

1Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila* agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. 2Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.” 3Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.