1 Samuel 23:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
1 Samuel 23:3 in English
1 Samuel 23:3 · Berean Standard Bible
But David’s men said to him, “Look, we are afraid here in Judah; how much more if we go to Keilah against the armies of the Philistines?”
Context
1Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila* agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. 2Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?”
Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.” 3Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?” 4Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.” 5Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.