1 Samuel 2:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.
1 Samuel 2:12 in English
1 Samuel 2:12 · Berean Standard Bible
Now the sons of Eli were wicked men; they had no regard for the LORD
Context
10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
“Ọ ga-enye eze ya ike
bulikwaa ịdị ike* nke onye ya e tere mmanụ.” 11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. 12Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya. 13Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. 14Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.