1 Samuel 2:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
1 Samuel 2:11 in English
1 Samuel 2:11 · Berean Standard Bible
Then Elkanah went home to Ramah, but the boy began ministering to the LORD before Eli the priest.
Context
9Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya
ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.
“Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. 10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
“Ọ ga-enye eze ya ike
bulikwaa ịdị ike* nke onye ya e tere mmanụ.” 11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. 12Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya. 13Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.