1 Samuel 2:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
1 Samuel 2:9 in English
1 Samuel 2:9 · Berean Standard Bible
He guards the steps of His faithful ones, but the wicked perish in darkness; for by his own strength shall no man prevail.
Context
7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;
ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. 8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye
na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.
Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,
na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.
“Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị
nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. 9Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya
ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.
“Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. 10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.
Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.
Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.
“Ọ ga-enye eze ya ike
bulikwaa ịdị ike* nke onye ya e tere mmanụ.” 11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.