Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.

1 Samuel 19:7 in English

1 Samuel 19:7 · Berean Standard Bible

So Jonathan summoned David and told him all these things. Then Jonathan brought David to Saul to serve him as he had before.

Context

5Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị* ya?” 6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.” 7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ. 8Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ. 9Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.