1 Samuel 19:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.
1 Samuel 19:8 in English
1 Samuel 19:8 · Berean Standard Bible
When war broke out again, David went out and fought the Philistines and struck them with such a mighty blow that they fled before him.
Context
6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.” 7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ. 8Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ. 9Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara, 10Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.