Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị* ya?”

1 Samuel 19:5 in English

1 Samuel 19:5 · Berean Standard Bible

He took his life in his hands when he struck down the Philistine, and the LORD worked a great salvation for all Israel. You saw it and rejoiced, so why would you sin against innocent blood by killing David for no reason?”

Context

3Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.” 4Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. 5Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị* ya?” 6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.” 7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.