1 Samuel 19:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu.
1 Samuel 19:4 in English
1 Samuel 19:4 · Berean Standard Bible
Then Jonathan spoke well of David to his father Saul and said to him, “The king should not sin against his servant David; he has not sinned against you. In fact, his actions have been highly beneficial to you.
Context
2ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ. 3Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.” 4Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. 5Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị* ya?” 6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.