Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

1 Samuel 18:3 in English

1 Samuel 18:3 · Berean Standard Bible

Then Jonathan made a covenant with David because he loved him as himself.

Context

1Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 2Sọl mere ka Devid nọgide nʼụlọeze. O kwekwaghị ka ọ laghachi nʼụlọ nna ya. 3Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya. 4Jonatan yipụtara uwe o yi nʼahụ nye ya Devid, nyekwa ya uwe ime ahụ ya, na ọ bụladị mma agha ya, ma ụta ya na eriri ukwu* ya. 5Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.