1 Samuel 17:55
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?” Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.”
1 Samuel 17:55 in English
1 Samuel 17:55 · Berean Standard Bible
As Saul had watched David going out to confront the Philistine, he said to Abner the commander of the army, “Abner, whose son is this young man?” “As surely as you live, O king,” Abner replied, “I do not know.”
Context
53Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. 54Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya. 55Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?”
Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.” 56Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.” 57Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.