1 Samuel 17:53
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.
1 Samuel 17:53 in English
1 Samuel 17:53 · Berean Standard Bible
When the Israelites returned from their pursuit of the Philistines, they plundered their camps.
Context
51Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya!
Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. 52Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn. 53Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. 54Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya. 55Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?”
Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.