Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.

1 Samuel 17:51 in English

1 Samuel 17:51 · Berean Standard Bible

David ran and stood over him. He grabbed the Philistine’s sword and pulled it from its sheath and killed him; and he cut off his head with the sword. When the Philistines saw that their hero was dead, they turned and ran.

Context

49Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. 50Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. 51Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. 52Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn. 53Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.