1 Samuel 17:50
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.
1 Samuel 17:50 in English
1 Samuel 17:50 · Berean Standard Bible
Thus David prevailed over the Philistine with a sling and a stone; without a sword in his hand he struck down the Philistine and killed him.
Context
48Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. 49Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. 50Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. 51Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya!
Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. 52Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.