Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.

1 Samuel 1:26 in English

1 Samuel 1:26 · Berean Standard Bible

“Please, my lord,” said Hannah, “as surely as you live, my lord, I am the woman who stood here beside you praying to the LORD.

Context

24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo. 25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị. 27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya. 28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ. 1:3 Onye Izrel ọbụla kwesiri ịga nʼihu Onyenwe anyị maka ife ofufe, ugboro atọ kwa afọ. Dit 16:16-17; Ọpụ 23:14-19 Ebe ụlọ nzute na igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị, bụ ihe dịka iri kilomita atọ nʼebe ugwu ugwu Jerusalem. 1Sa 3:3; Jos 18:1 1:22 Nʼoge ochie, adịghị anapụ ụmụntakịrị ara ọsịịsọ, kama ọ bụ mgbe ha gbara afọ atọ maọbụ karịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.