Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.

1 Samuel 1:24 in English

1 Samuel 1:24 · Berean Standard Bible

Once she had weaned him, Hannah took the boy with her, along with a three-year-old bull,* an ephah of flour,* and a skin of wine. Though the boy was still young, she brought him to the house of the LORD at Shiloh.

Context

22Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara,* ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.” 23Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara. 24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo. 25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.