1 Samuel 1:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.
1 Samuel 1:27 in English
1 Samuel 1:27 · Berean Standard Bible
I prayed for this boy, and since the LORD has granted me what I asked of Him,
Context
25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị. 27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya. 28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.
1:3 Onye Izrel ọbụla kwesiri ịga nʼihu Onyenwe anyị maka ife ofufe, ugboro atọ kwa afọ. Dit 16:16-17; Ọpụ 23:14-19 Ebe ụlọ nzute na igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị, bụ ihe dịka iri kilomita atọ nʼebe ugwu ugwu Jerusalem. 1Sa 3:3; Jos 18:1
1:22 Nʼoge ochie, adịghị anapụ ụmụntakịrị ara ọsịịsọ, kama ọ bụ mgbe ha gbara afọ atọ maọbụ karịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.