1 Pita 3:10
1 Peter 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
1 Peter 3:10 in English
1 Peter 3:10 · Berean Standard Bible
For, “Whoever would love life and see good days must keep his tongue from evil and his lips from deceitful speech.
Context
8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala. 9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu. 10Nʼihi na,
“Onye ọbụla nke na-achọ ndụ,
nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma,
ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ
meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ. 11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe;
ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya. 12Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha,
ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.