1 Pita 3:12
1 Peter 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”*
1 Peter 3:12 in English
1 Peter 3:12 · Berean Standard Bible
For the eyes of the Lord are on the righteous, and His ears are inclined to their prayer. But the face of the Lord is against those who do evil.”*
Context
10Nʼihi na,
“Onye ọbụla nke na-achọ ndụ,
nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma,
ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ
meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ. 11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe;
ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya. 12Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha,
ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”* 13Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe? 14Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.