1 Pita 3:13
1 Peter 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe?
1 Peter 3:13 in English
1 Peter 3:13 · Berean Standard Bible
Who can harm you if you are zealous for what is good?
Context
11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe;
ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya. 12Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha,
ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”* 13Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe? 14Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.”* 15Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.