Native Bible

1 Kings 8:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya.

1 Kings 8:51 in English

1 Kings 8:51 · Berean Standard Bible

For they are Your people and Your inheritance; You brought them out of Egypt, out of the furnace for iron.

Context

49mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka. 50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere. 51Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya. 52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa. 53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.