1 Ndị Eze 8:52
1 Kings 8:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa.
1 Kings 8:52 in English
1 Kings 8:52 · Berean Standard Bible
May Your eyes be open to the pleas of Your servant and of Your people Israel, and may You listen to them whenever they call to You.
Context
50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere. 51Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya. 52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa. 53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.” 54Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.