1 Ndị Eze 8:53
1 Kings 8:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”
1 Kings 8:53 in English
1 Kings 8:53 · Berean Standard Bible
For You, O Lord GOD, as Your inheritance, have set them apart from all the peoples of the earth, as You spoke through Your servant Moses when You brought our fathers out of Egypt.”
Context
51Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya. 52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa. 53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.” 54Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu. 55O guzoro gọzie ọgbakọ Izrel niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.