Native Bible

1 Kings 7:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.

1 Kings 7:50 in English

1 Kings 7:50 · Berean Standard Bible

the pure gold basins, wick trimmers, sprinkling bowls, ladles, and censers; and the gold hinges for the doors of the inner temple (that is, the Most Holy Place *) as well as for the doors of the main hall of the temple.

Context

48Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị. 49E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe,* nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile; 50na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu. 51Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 7:2 Aha a, bụ nʼihi ogidi osisi sida eji wuo ụlọeze, nke e si Lebanọn buta, bụ ndị edoro nʼahịrị nʼahịrị dịka osisi dị nʼime ọhịa. 7:23 Ndị nchụaja na-eji mmiri dị nʼime ya na-asa ụkwụ na aka ha, tupu ha a baa nʼụlọ nzute nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ nke na-esi isi ụtọ. Ọpụ 30:17-21 7:38 Maọbụ, ihe ruru narị lita asatọ na iri asatọ 7:49 Nʼụlọ nzute, ọ bụ naanị otu ihe ịdọba oriọna nwere iheọkụ asaa ka e nwere. Ma Solomọn kpụrụ nke nwere iheọkụ iri were dochie nke ochie ahụ. Ọpụ 25:31-40; 26:35

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.