1 Ndị Eze 7:51
1 Kings 7:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 7:2 Aha a, bụ nʼihi ogidi osisi sida eji wuo ụlọeze, nke e si Lebanọn buta, bụ ndị edoro nʼahịrị nʼahịrị dịka osisi dị nʼime ọhịa. 7:23 Ndị nchụaja na-eji mmiri dị nʼime ya na-asa ụkwụ na aka ha, tupu ha a baa nʼụlọ nzute nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ nke na-esi isi ụtọ. Ọpụ 30:17-21 7:38 Maọbụ, ihe ruru narị lita asatọ na iri asatọ 7:49 Nʼụlọ nzute, ọ bụ naanị otu ihe ịdọba oriọna nwere iheọkụ asaa ka e nwere. Ma Solomọn kpụrụ nke nwere iheọkụ iri were dochie nke ochie ahụ. Ọpụ 25:31-40; 26:35
1 Kings 7:51 in English
1 Kings 7:51 · Berean Standard Bible
So all the work that King Solomon had performed for the house of the LORD was completed. Then Solomon brought in the items his father David had dedicated—the silver, the gold, and the furnishings—and he placed them in the treasuries of the house of the LORD.
Context
49E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe,* nʼihu ime ime ebe nsọ;
tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile; 50na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ;
na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu. 51Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
7:2 Aha a, bụ nʼihi ogidi osisi sida eji wuo ụlọeze, nke e si Lebanọn buta, bụ ndị edoro nʼahịrị nʼahịrị dịka osisi dị nʼime ọhịa.
7:23 Ndị nchụaja na-eji mmiri dị nʼime ya na-asa ụkwụ na aka ha, tupu ha a baa nʼụlọ nzute nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ nke na-esi isi ụtọ. Ọpụ 30:17-21
7:38 Maọbụ, ihe ruru narị lita asatọ na iri asatọ
7:49 Nʼụlọ nzute, ọ bụ naanị otu ihe ịdọba oriọna nwere iheọkụ asaa ka e nwere. Ma Solomọn kpụrụ nke nwere iheọkụ iri were dochie nke ochie ahụ. Ọpụ 25:31-40; 26:35
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.