Native Bible

1 Kings 7:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.

1 Kings 7:48 in English

1 Kings 7:48 · Berean Standard Bible

Solomon also made all the furnishings for the house of the LORD: the golden altar; the golden table on which was placed the Bread of the Presence;

Context

46Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a. 47Ma Solomọn atụghị ihe ndị a niile a kpụrụ nʼihe ọtụtụ, nʼihi na ha dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ, achọpụtaghịkwa ịdị arọ nke bronz ahụ. 48Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị. 49E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe,* nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile; 50na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.