Native Bible

1 Kings 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla.

1 Kings 5:4 in English

1 Kings 5:4 · Berean Standard Bible

But now the LORD my God has given me rest on every side, and there is no adversary or crisis.

Context

2Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya: 3“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ.* Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla. 5Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ 6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.